Psalms 3

Abụ Ọma Devid. Nke o dere mgbe o si nʼihu Absalọm gbapụ ọsọ ndụ.

Ekpere maka enyemaka

1O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m.
2Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị,
“Chineke agaghị azọpụta ya.” Sela
Okwu Hibru nʼusoro abụ nke a na-amaghị ihe ọ pụtara, ụfọdụ na-eche na ọ bụ okwu ntụziaka nye ndị ọbụ abụ banyere ihe ha ga-eme


3Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m;
I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ.
4Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa,
ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela

5Edinara m ala, hie ụra,
ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche.
6A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu,
agaghị m atụ egwu ọbụla.

7Bilie Onyenwe anyị!
Zọpụta m Chineke m!
Tie ndị iro m niile aka nʼagba; b
tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ.

8Nʼihi na nzọpụta na-esite nʼebe Onyenwe anyị nọ na-abịa.
Ka ngọzị gị dịịrị ndị gị niile. Sela
Copyright information for IboBIU